Otu INC ariola president bola Ahmed tinubu ka onye Mazi Nyelsom Wike ndumodu banyere okwu okwuru megide agburu ijaw.

Written by on March 15, 2025

Otu Ijaw National Congress INC ariola onye isi ala anyi bu president bola Ahmed tinubu ,ka onye nwa amadi ahu ji okwa FCT Minister bu Mazi Nyesom Wike ndumodu,banyere okwu okwuru megide agburu ijaw

Mazi Nyelsom Wike ka ana ebo obubo na okwuru si, na umu afo ijaw bu ndi opekata mpe na ndi ogogo nta enwere na Rivers state nakwa na mpaghara ndi ozo dina south south ma ewezuga Bayelsa.

Na nzaghachi ya,Ka onye ji okwa National Publicity Secretary nyere otu INC bu chief Ezonebi Oyakemeagbegha noro n’ ozi oweputara n’ Abuja tata bu Friday me ka amata, na Otu congress ha anugo onu okwu onye FCT Minister kwuru nyere agburu ahu.

Otu INC mere ka amata na agburu ijaw gbara ndi nke ano na ndi kacha buo ibu n’ agburu nile enwere na ala anyi a bu Nigeria,dika ha nwere onu ogugu mmadu kariri nde iri ano ma burukwa agburu ochie enwere n’ ala anyi a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited