Aroputala eze odinala ohuru obodo Amana dina Ezza South LGA nke Ebonyi State.
Written by Onyinye on March 18, 2025
Achikobala ogbako ntule aka ochichi ejiri roputa eze odinala ohuru obodo Amana Autonomous Community dina Ezza South LGA nke Ebonyi State bukwanu ebe anoro roputa Chief Clement Nweke Nwoga dika onye eze odinala ohuru yabu obodo.
Nke a putara ihe na ubochi Saturday na yabu ogbako ntule aka ochichi dotara puku kwuru puku ndi obodo ahu.
Na ogbakọ ntule aka ochichi a ka Chief Nwoga noro nweta akwukwo vote di nari ise na iri isii were merie onye zosara ya yabu okwa eze odinala bu Chief Zachaeus Nwennewor nwetara naani vote ato.
Anokwara na otu aka ahu huta ndi sitere ulo olu ministry Ebonyi State na ahu maka okpuru ochichi ime obodo nakwa echimechi ka ha wuchiri ileta ka yabu ntule aka ochichi siri ga, ebe ndi uwe oji nakwa ndi agha military noro na aka nke ha sonyere inye ohaneze nchekwa.
Ka aroputachara nwa amadi a ka agara na iru chie ya echichi eze odinala obodo Amana dika osiri di na iwu obodo ahu, ebe yabu eze odinala ohuru mechara buru ukpo ekene bugara Gov Francis Ogbonna Nwifuru na achi Ebonyi State maka iweta udo na obodo Amana dika okwere nkwa ezi ochichi na obodo ahu.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na obu kemgbe afo 2014 onye jibu okwa eze odinala obodo ahu bu HRH Eze Kenneth Nworie nwuru ka obodo Amana no na enweghi onye eze odinala na achikwa ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.