Otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP enwetala ihe mkpobi ukwu ozo dika osiri metuta etu ndi eji okoloto yabu otu ndorondoro roputa na okwa ochichi siri agbapugasi na otu ndorondoro a

Written by on March 19, 2025

Otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP agala na iru na inweta ihe mkpobi ukwu ozo dika osiri metuta etu ndi eji okoloto yabu otu ndorondoro roputa na okwa ochichi siri agbapugasi na otu ndorondoro a mana abanye na otu ndorondoro ndi ozo.

Nke a putara ihe unya bu Tuesday dika mmadu abuo ndi omebe iwu ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives ala anyi sitere na otu ndorondoro PDP banye na nke All Progressives Congress APC.

Habu mmadu abuo ndi omebe iwu gbaghapuru PDP banye na APC gunyere: Hon Hussein Jallo na anochite ogbonta vote Igabi Federal Constituency nke Kaduna State nakwa Hon Adamu Tanko na anochite Suleja/Tara/Gurara Federal Constituency nke Niger State.

Ndi a kowara na opupu ha na otu ndorondoro PDP bu kwere maka nghotahe no kemgbe na yabu otu ndorondoro na ogogo etiti ala anyi.

Na ozi opupu ndi a puru na PDP banye APC onu na ekwuru ulo nzuko ahu na okwa Speaker bu Rt Hon Tajudeen Abbas guputara na ogbako plenary ha unya ka mmadu abuo ndi omebe iwu a kowara na nghotahe otu ndorondoro PDP ewetagoro ha ihe mkpobi ukwu na inochite ndi ogbonta vote ha nke oma.

Ozi kowara na nke a na abia dika Hon Amos Magaji sitekwuru Kaduna State noro na odi nso a gbaghapu otu ndorondoro PDP ma banye na otu ndorondoro APC.

Na aka nke ozo ka Sen Ned Nwoko na anochite ogbonta vote Delta North Senatorial District na ulo nzuko ukwu Senate ala anyi nokwara na odi nso a gbaghapu otu ndorondoro PDP ma banye na nke APC, gunyekwara ufodu ndi omebe iwu nakwa ndi ochichi ozo sitegoro na otu ndorondoro a banye na nke APC kemgbe emechara ntule aka ochichi izugbe na afo 2023.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited