Onye ndu nke otu Indigenous people of Biafra bụ Mazi Nnamdi Kanu arịọla mgbaghara banyere etu o siri kpaa agwa n’oge ikpeazụ ọ wuchara n’ụlọ ikpe.
Written by Onyinye on March 21, 2025
Onye ndu nke otu Indigenous people of Biafra bụ Mazi Nnamdi Kanu arịọla mgbaghara nyere Ụlọikpe federal High Court, Justice Binta Nyako yana ọka iwu Adegboyega Awomolo banyere etu o siri kwuo okwu ma ọ bụ kpaa agwa na mgbe ikpeazụ ọ nọrọ wuchaa n’ụlọ ikpe maka ebubo ịgba gọọmenti mgba okpuru ahụ ana ebo.
Nwa amadi ahụ jiri obi ịhụnanya were rịọ ya bụ mgbaghara sị ka agbaghara ya omume ndị ahụ ma kwe nkwa ibi ndụ ezi omume n’ime oge ndị ahụ Ụlọikpe ga anọrọ lebaa ebubo ndị ana ebo ya anya.
Arịrịọ ndị a pụtara ihe n’otu akwụkwọ ozi nke onye ndu nke ndị ọka iwu ya ma bụrụkwa onye jibu ọkwa attorney General of the Federation n’ala anyị bụ Justice Kanu Agabi wepụtara ụlọikpe.
Na arịrịọ ndị a na-emetu n’obi ka Nnamdi Kanu rịọrọ ọka ikpe Justice Nyako yana Awomolo ka ha gbaghara ya n’otu n’otu maka okwu ndị ahụ ya jiri oke iwe were kwuo n’oge ikpe ya n’aga n’ihu.
N’okwu ya ka Justice Agabi kwuru na Kanu nwere ikikere iwe iwe mana o kwesịghị ikwu okwu ọbụla n’oge iwe juru ya obi.
N’aka nke ya ka Adegboyega Awomolo kwuru na arịrịọ ahụ Kanu rịọrọ site n’aka ọka iwu ya metụrụ ya n’obi. Were kwuo na ya agbagharala Nnamdi Kanu na okwu ndị ahụ niile o kwuru kwugide ya n’ụlọ ikpe.
Awomolo kwuru na ya abụghị onye na-emegide mmadụ ibe ya kama na ha niile na arụko ọrụ ọnụ ịhụ na e nyere Mazi Nnamdi Kanu ikpe nkwụmoto n’ikpeazụ ma meekwa nke ahụ n’oge.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.