Mba Israel anọrọla ụnyaahụ bụ ụka were tụọ ogbunigwe ọzọ na ndịda ugwu obodo Beirut bụ isi ọchịchị mba Lebanon.

Written by on April 28, 2025

Mba Israel anọrọla ụnyaahụ bụ ụka were tụọ ogbunigwe ọzọ na ndịda ugwu obodo Beirut bụ isi ọchịchị mba Lebanon dịka ha nyechara iwu ka ndị mmadụ kwapụ n’otu ụlọ nke ha kwuru na ndị agha ọ lụọ ọ laa akpọrọ Hezbollah nke mba Iran na akwado ji ya bụ ụlọ mere ebe ize ndụ.

Nkusu na-abịa n’agbanyeghị na ububo udo nke itinye mma n’obo n’etiti mba Israel hana ndị agha ntị ịkpọ ahụ ka dị irè kemgbe ọnwa ise gara aga a malitere ya.

Mba Israel kwuru n’ogige ahụ bụ ebe otu Hezbollah na ezo ogbunigwe ha akpọrọ missiles bụ nke nọ dịka ihe iyi egwu dịrị mba Israel yana ụmụ afọ ya.

Ọchịchị mba Lebanon akatola nkusu ahụ ma kpọọ oku ka mba United States yana France dọọ Israel aka ná ntị ka tinye mma ha n’obo dịka otu abụọ ahụ siri nwee nkwekọrịta.

Nkusu ahụ bụ nke mbụ Israel na-eme n’obodo Beirut n’ime ihe ruru otu ọnwa ugbua dịka ha mekwara ka amata na o nweghị ihe ọbụla pụrụ igbochi ha ime nkusu n’ihe ọbụla ha hụrụ dịka ihe iyi dịrị obodo ha yana ụmụ afọ ha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited