Onye enyemaka pụrụ iche nyere aka na chi Delta State n’ihe gbasara mkpokọta ndị ntorobịa emela ka amata ihe kpatara aka na chi State ahụ jiri si na otu ndọrọndọrọ PDP pụọ ga na otu ndọrọndọrọ APC.

Written by on April 29, 2025

Onye enyemaka pụrụ iche nyere aka na chi Delta State n’ihe gbasara mkpokọta ndị ntorobịa bu Hon. Onwusanya Peter, emela ka amata ihe kpatara aka na chi Delta State jiri si na otu ndọrọndọrọ PDP pụọ gawa na otu ndọrọndọrọ APC.

Aka na chi Delta State bu Governor Sheriff Oborevwori ya na ndi omebe iwu State ahụ, ndị isi oche ọchịchị ime obodo, ndị Councillors nakwa usoro nile nke otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party PDP na State ahụ abanyela na otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress APC.

N’okwụ ya, Hon. Onwusanya kọwara mkpebi ahụ dika atụmatụ emere ofụma iji wee kwalite ọdị mma ụmụ afọ State ahụ nakwa government Delta State.

O mere ka amata na mkpebi ahụ bu atụmatụ iji mee ka State ahụ kwudosie ike na government etiti, bukwanu nke ga enyere aka weta aku n’ụba nakwa mmepe na State ahụ.

Ọ kọwara na mkpebi ahụ ga enyere aka kpọga State ahụ nso n’obi onye isi ala ma weta ezi ohere ọrụ ngo site n’aka government etiti.

Ọ gara n’iru mee ka amata na o kwenyere na ebe aka na chi State ahụ nakwa ndị ọnụ n’eru n’okwu kpọ ga aga bu ebe ka mma ya nakwa maka ọdị mma ụmụ afọ State ahụ.

Hon. Onwusanya kọwara na Delta State ga na enwetazi oke ruru ha site n’aka government etiti, ma kwe nkwa na State ahụ so na ndi ndu na okwe ndọrọndọrọ ala anyi bu Nigeria ya nakwa ebe agbasa akụ n’ụba ala anyi a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited