Aka ndị uweojii na Lagos State akpatala otu nwatakịrị nwoke kwere maka na oji egbe.

Written by on April 29, 2025

Ndị uweojii na Lagos State emela ka amata ụnya bu Sunday na aka ha akpatala otu nwatakịrị nwoke dị afọ iri na ịsịị bu onye enyere aha ya dika Solomon Ibiwoye n’ebe oji egbe locally made pistol na Ebute-Ero area na State ahụ.

Onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii bu CSP Benjamin Hundeyin mere ka nkea puta ihe n’ozi o weputara na uwa ozi ha ụnya bu Sunday.

N’okwụ ya, Hundeyin mere ka amata na ọ bu site na mbọ ohaneze mere ha jiri nwuchie nwatakịrị nwoke ahụ, dika o kenere ụmụ afọ State ahụ etu ha siri kpọturu ndị uweojii oge ha hụrụ na Solomon ji egbe n’aka.

Ọ gara n’iru mee ka amata na oge ndị uweojii gara n’ulo nwatakịrị nwoke ahụ maka nyocha, na ha nwetara locally fabricated firearm nakwa cartridge, dika okwuru na nyocha ka na aga n’iru.

Na ihe yiri nke ahụ, ka ozi kọwara na anwụchiri nwatakịrị nwoke dị afọ iri na ise bu onye enyedebere aha ya dika Emmanuel n’onwa March afọ 2018 na ụlọ akwụkwọ Community Secondary school, Akenfa-Epie nke dị na Yenagoa LGA na Bayelsa State, ebe oji egbe locally made pistol n’ụlọ akwụkwọ.

Ozi gara n’iru mee ka amata na anwụchiri nwatakịrị nwoke ahụ oge ọ ka yi afe akwụkwọ ya dika ndị Akenfa community kpọturu ndị vigilante group bu ndi nwuchiri ma nyefe ya n’aka ndị uweojii.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited