Aka na chi Kebbi State bu Governor Nasir Idris akagbuola ozi ahụ n’efeghari na ọ chọrọ iso nwa amadi ahụ jibu ọkwa osote onye isi ala anyi bu Atiku Abubakar jikọ aka ọnụ.
Written by Onyinye on April 29, 2025
Aka na chi Kebbi State bu Governor Nasir Idris akagbuola ozi ahụ n’efeghari na ọ chọrọ iso nwa amadi ahụ jibu ọkwa osote onye isi ala anyi bu Atiku Abubakar jikọ aka ọnụ.
Ozi putara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye odeakwụkwọ ya na mgbasa ozi bu Ahmed Idris, kọwara ozi ahụ n’efeghari dika okwu asi bukwanu nke sitere n’aka ndị na agba asiri.
Governor Idris mere ka amata na ọ bu ya ga abu onye ikpeazu ga nọ na otu ndọrọndọrọ All Progressive Congress APC, o kwuru na onweghị mgbe ojiri chee echiche ịhapụ otu ndọrọndọrọ APC ma ọbukwanu sonyere ihe ọbula Atiku na achikoba.
Governor Idris mere ka amata na ọ bu otu ndọrọndọrọ APC mere ya onye ọ bu, bukwanu otu ndọrọndọrọ o siri na ya buru Governor Kebbi State, ya mere na onweghi ebe ọ na aga.
Ọ kọwara na nanị ihe bu ebum n’uche ya bu etu ọ ga esi ga n’iru weta mmepe na ngalaba nile di na State ahụ, dika o mere ka amata na onweghi ihe ga egbochi ezi ọchịchị na State ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.