Mba United Kingdom ajula inye otu onye okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ọkwa ya gbagotere na mba South Africa akwụkwọ visa ịbata n’obodo ha.

Written by on May 8, 2025

Otu onye okwe ndọrọndọrọ ọchịchị na ama gọọmenti aka n’ihu na mba South Africa bụ Julius Malema abụrụla onye a jụrụ ịnye akwụkwọ ikike eji eme njem akpọrọ visa ịga sonyere n’otu ọgbakọ conference ga ewere ọnọdụ na mba United Kingdom n’abalị iri nke ọnwa a.

Malema kwuru na mba UK enweghị ihe ọbụla ha ga ekwu na ọ bụ ya kpatara ha ime nke ahụ kama na ọ bụ otú ụzọ ha chọrọ iji mee amụma okwe ndọrọndọrọ ọchịchị ya nyuo ka ọkụ.

N’otu akwụkwọ ozi pụtara ihe site n’aka ụlọrụ nnọchiteanya mba United Kingdom n’obodo South Africa akpọrọ UK High commission ka Anthony Philipson kwuru na obodo ya enweghị ike imenwu nke ahụ n’oge maka ya bụ njem.

Julius Malema bụ onye ndu nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị akpọrọ economic freedom fighters party nke mba South Africa ma bụrụ onye na-alụ ọgụ kemgbe ịhụ na enweghị ihe dịka otu mpaghara ala nke ọ bụ naanị ndị ọcha nwe ya na mba South Africa.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited