Ọchịchị mba Congo amachiela ndị nta akụkọ ịgba nwa amadi ahụ bụbu onyeisi ala obodo ahụ bụ Joseph Kabila ajụjụ ọnụ ma ọ bụ onye ọ bụla si n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya.
Written by Onyinye on June 5, 2025
Gọọmenti mba Democratic Republic of Congo enyela iwu nke machiri ndị nta akụkọ ịgbasa ozi ọbụla metụtara onye jibu ọkwa onyeisi obodo ahụ n’oge gara aga bụ Joseph Kabila ma ọ bụ gbaa onye ọ bụla so n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ya ajụjụ ọnụ.
Mmachia na-abịa ngwa ngwa Joseph Kabila lọghachichara azụ na mba ahụ n’ọnwa gara aga ma mee ka esemokwu dị n’etiti yana ogbo ya na-achị mba ahụ ugbua bụ President Félix Tshisekedi kawanye njọ.
Ọchịchị mba Congo n’agbasi mbọ ike ugbua ịkpụpu Kabila n’ụlọ ikpe ma kpee ya ikpe na ebubo ndị gụnyere ịgba gọọmenti mgba okpuru yana ikwado otu isi ekwe ọnwụ akpọrọ M23 rebel group nọ kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga na ebuso ndị agha mba Congo agha bụkwa ebubo ndị nwa amadi ahụ goro ụkwụ n’aka ya.
Onye ji ọkwa media regulator na mba DR Congo bụ Christian Bosembe kwuru na onye ọ bụla nupụrụ isi na iwu mmachi ka aga amachikwa n’otu aka ahụ.
Na nzaghachi ya nyere iwu a ka onye ji ọkwa regulator nyere ụlọrụ akpọrọ supreme Council of audiovisual and communication ma bụrụkwa ọnụ na e kwuru otu M23 rebel group kwuru na ụlọrụ mgbasa ozi enwere na mpaghara nke ha na-achị eze agaghị erube isi na iwu ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.