Ndị uweojii ala anyị na Nasarawa State ekwuputala ezi ọrụ ha banyere mgba ha na agba emegide ndị omekome na State ahụ.
Written by Onyinye on August 25, 2025
Ndị uweojii ala anyị na Nasarawa State ekwuputala ezi ọrụ ha banyere mgba ha na agba emegide ndị omekome, ma nwụchikọ ụfọdụ ndị ntọri nakwa onyi ịsị ndị otu oji egbe aga na akpa ike ọjọ na State ahụ.
Nkea pụtara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu SP Ramhan Nansel, dika ọ kọwara na ndi uweojii agbakwụnyere ndị ọrụ Doma Division jikọrọ aka ọnụ ruọ ọru ma nwụchikọ onye ịsị ndị ntọri enyere aha ya dika, Mohammed Bammi bu onye amakariri dịka Zomo bụkwanụ onye aka ya dị na ọtụtụ ntọri nakwa ori ana ezu na Doma LGA nakwa gburugburu ya.
Nnyocha gara n’iru duga ndị uweojii ahụ n’ebe ndị ntọri ji mere isi ọnọdụ na Alagye village bu ebe ha nwetara ọtụtụ ngwa ọgu ndị gụnyere: otu pump-action rifle nke akara ya bu P331551, otu locally made AK-47 with rifle magazine, live rounds of ammunition abụọ, Cartridges ise, otu nma na ụdọ, Ekwentị Tecno abụọ nakwa akwa ndị ọrụ nchekwa Nigeria Security and Civil Defence Corps NSCDC.
Na akụkọ dịka ibe ya, ndị uweojii agbakwụnyere ndị nke sitere Awe Area Command, wakporo ebe ndị ntọri ji mere isi ọnọdụ na Gidan Taku village, dị na Wuse Chiefdom Awe LGA, ma nwụchikọ mmadụ ise so n’ime otu mmadụ iri ana enyo enyo na ha bu ndi ntọri.
Mmadụ ise ndị ahụ anwụchiri gụnyere: Michael Ato, Richard Ato, Alom Bernard, Hangior Ato nakwa Jacob Hunde, amakariri dịka Okocha.
Otu ahụ bu ndị ozi kọwara na ha tọrọ otu nwanyi enyere aha ya dika Blessing John nke Gidan Makaranta village, Wuse, dika nyocha dị uweojii gara n’iru chọpụta na n’ọnwa April afọ 2024, na otu ahụ bukwa ndi tọrọ dị Blessing, enyere aha ya dika John Ada Kuje ma natakwa ego ntọghapụ n’isi ya.
Ihe ndị uweojii nwetara n’aka ndị ahụ ha nwuchiri gụnyere: locally fabricated AK-47 rifles abụọ nakwa One live round of ammunition.
Commissioner ndị uweojii toro mbọ nakwa ezi ọrụ ndị uweojii ahụ rụrụ, dika ọ gara n’iru gwa ha ka ha gba mbọ ga n’iru na akwanye ndị omekome ọkụ n’ukwu ganye mgbe ekpochapuru ndị ntọri nakwa ndị oji egbe aga na State ahụ.
Dika ha mere ka amata na enyefela ndị ahụ ana enyo enyo ha nwuchiri n’aka Anti-Kidnapping Unit maka nyocha zuru oke nakwa ịkpụ ha n’ụlọ ikpe ngwa ngwa ha mechara nyocha ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.