Mba North Korea Eyiela Egwu Ikpochapu Mba South Korea
Written by admin on February 26, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi ala mba North Korea bu President Kim Jong Un eyiela egwu iji ndi agha mba ahu gaa kpochapu mba South Korea kpamkpam na elu uwa a dika osiri metuta ajo onodu ngwere na agwo diwara kemgbe na etiti habu mba abuo gbara onwe ha agbata obi.
President Kim Jong Un gara na iru mee ka amata na okwusigo agam na iru mkpagharita ububo na etiti yabu mba North Korea nyere South Korea.
Nwa amadi a kwuputara na mkparita ububo nke dina etiti mba ya nyere mba United States of America ga aga na iru naani ma oburu na America akwusi usoro iwu niile ojigasi na aka megide mba ya.
Yabu onye isi ala mba North Korea gwara America ka okwanyere onodu mba ahu ka odi ugbu a ugwu dika osiri di na iwu na achikwa yabu North Korea.
Na okwu ya unya bu Wednesday na mmechi ogbako otu ndorondoro ochichi Worker’s Party of Korea WPK nona isi ugbo ochichi mba ahu ma buru ogbako were otu izu uka ka President Kim Jong Un mere ka amata na onweghi ihe ozo nwere isi North Korea ga eji gaa na iru na ezi onodu nyere mba America.
Na ozi nke putara ihe taata bu Thursday site na usoro mgbasa ozi Korean Central News Agency ka President Kim Jong Un kporo oku iruputakwu ngwa agha ohuru maka nkwalite ume ndi agha ogwuru mba akporo Nuclear Armed Military mba ahu.
Yabu onye isi mba North Korea turu atumatu ngwa agha Intercontinental Ballistic Missiles aga anoro na okpuru mmiri gbape nakwa mgbatikwu aka ngwa ogu Tactical Nuclear Weapons ndi gunyere: Artillery nakwa Short Range Missiles nwere ike ikpochapu mba South Korea kpamkpam na elu uwa a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.