Ndi Uwe Ojii Anwuchiela Ogbo Ha Ndi Olu Nchekwa Customs Na Osun State
Written by admin on March 16, 2026
by Chidimma Kama
Ndị uwe ojii ala anyị na Osun State emela ka amata na ha anwụchịela mmadụ abụọ bụ ndị ọrụ nchekwa Nigeria Customs Service NCS, na njikọ banyere izo mgbọ egbe aghara aghara bụkwanụ ebe otu onye ọkpụ ụgbọala zutere ọnwụ ya n’ike na Osogbo.
Nkea pụtara ihe site n’ozi onye mmekọrịta ọhaneze nyere habụ ndị uweojii na State ahụ bụ DSP Abiodun Ojelabi, wepụtara ụnya bụ ụka.
Yabụ onye Police Public Relations Officer PPRO kọwara na anwụchiri ndị ọrụ NCS mmadụ abụọ ahụ na njikọ okwu banyere ọdachi izo mgbọ egbe aghara aghara bụkwanụ nke mere na Dada Estate Area, Osogbo ụnya bụ ụka.
Dịka ozi kọwara na ndị ahụ ana enyo enyo na achụ ụgbọala ana enyo enyo na ọ bụ tokunbo n’oge yabụ ọdachi mere, k’osila dị, agbara onye ọkpụ ụgbọala Toyota Corolla bụkwanụ otu n’ime ụgbọala ha na achụ ọsọ egbe, ebe onye dọkịta kwupụtara ọnwụ ya n’ụlọ ọgwụ Osun State University Teaching Hospital.
Yabụ onye PPRO mere ka amata na etinyego ozu nwa amadi ahụ nwụrụ anwụ aka matabeghi onye ọbụ n’ọba nchekwa ozu, dịka ọ gara n’iru kọwaa na enwetara ọtụtụ ihe n’ebe ahụ ọdachi ahụ mere ndị gụnyere: otu egbe Beratta pistol akara njirimara ya bụ 125024, mgbọ egbe 11 rounds of 9mm dịcha ndụ nakwa otu expanded 9mm shell.
Ebe ihe ndị ọzọ enwetakwara ebe ahụ gụnyere: otu ụgbọala Toyota Corolla dị ọcha bụ akara Lagos registration number AAA 400 GQ nakwa ụgbọala Toyota Corolla n’acha ntụ ntụ bụkwa akara registration number GFQ 0982.
DSP Ojelabi mekwara ka amata na Commissioner ndị uweojii bụ CP Ibrahim Gotan, nyere ntụziaka ka eme nyocha mịrị emị iji chọpụta ihe kpatara ọdachi ahụ, dịka okwere ọhaneze nkwa na onye ọbụla achọpụtara n’aka ya dị n’ọdachi ahụ ga enweta ntaramahụhụ ruru ya dịka iwu sịrị dị.
Ọ gakwara n’iru riọ ọhaneze ka ha dere jụụ ma ga n’iru na enyere ndị ọrụ nchekwa aka site n’inye ha ozi ga abara ha uru na nyocha ahụ n’aga n’iru k’ọdị ugbua.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.