Aka Akpatala Otu Nwoke Onye Eze Odinala Ziri Ka Ogbuoro Ya Mmadu Na Rivers State
Written by admin on March 20, 2026
by Chika Nwazu
Aka ndị uwe ojii na Rivers State akparala otu nwoke gbara afọ iri abụọ na itoolu bụ Robinson Uche maka ebubo igbu onye ọzọ gbara afọ iri anọ na abụọ bụ Shedrack Ogadinma Chukwem.
Ndị uwe ojii kwuru na nwa amadi ahụ yana mmadụ anọ ndị ọzọ nọ na ọsọ ugbua ka otu onyeze ọdịnala bụ Chief Elijah Okere kwụrụ ụgwọ ka ha butere ya ozu nwoke ahụ na obi eze ya.
Ozi mere ka amata na Uche ka aka ndị uwe ojii Anti cultism unit dina Emuoha mechara nwuchie n’abalị isii nke ọnwa March site na ozi dị mkpa ha nwetara banyere ya.
Na ajụjụ agbara ya ka o mechara kweta na ya so kpaa arụ n’abalị iri na asaa nke ọnwa Dec afọ 2025 n’obodo Igbo Etche nke Etche LGA Rivers State.
Na nkọwa ka o kwuru na onyeze ọdịnala ahụ kpọtụrụ yana ndị otu ya nọ na ọsọ ugbua ka ha nwuchiere ya Shedrack Ogadinma Chukwem ma kpụta ya na obi eze. Mana ndị ezinụlọ ya gbochiri ha ime nke ahụ n’ụbọchị ahụ nke mere ka ha gbapụ egbè gbagbuo nwoke ahụ n’otu ntabi anya.
Ha mechara buru ozu ya gaa lie n’ọhịa dina obodo Ekerre Ugbor.
Ugbua, ndị uwe ojii agala voputa ozu ahụ gaa dọwaa ya na oba nchekwa ozu nke ụlọ ọgwụ military Hospital Mortuary dina Rivers State maka ime nyocha autopsy.
Ebe ndị uwe ojii amalitela igba mbọ etu aga esi nwuchie ndị ahụ nọ na ọsọ nke onyeze ọdịnala ahụ so n’ime ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.