Umu Afo Mba South Africa Emela Ngaghari Iwe Ka Achupu Umu Afo Nigeria Nakwa Umu Afo Ufodu Mba Ndi Ozo Nona Mba Ahu

Written by on March 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu kwuru na onwe ha na mba South Africa emela ngaghari iwe na mpaghara Durban nke mba ahu ma kpo oku iwu siri ike nke njem mbata na udi immigration laws nakwa nchekwa okere ala ha megide ndi si mba ozo nke umu afo ala anyi a bu Nigeria sona ime ha.

Habu otu ahutara ufodu otu ndorondoro dika nke Action SA nakwa otu vigilante anti migrant group amara dika Operation Dudula ka ha sonyere na yabu ngaghari iwe kporo oku igbara ha ugbonwamkpi bu ndi niile ahu sitere mba ozo bata yabu South Africa na enwetaghi ikikere nke oma.

Habu ndi otu jikoro onwe ha onu zaa aha dika March and March katoro onodu obuna ochichi mba ahu inye ohere ka ndi mba ozo na enwetaghi ikikere nke oma banye ma obu biri na South Africa.

Na okwu ya ka onye ndu ha bu Jacinta Ngobese Zuma kowara ya dika nke na ekwesighi ekwesi govt mba ahu irapu habu ndi sitere mba ozo irite elele akuru ngwa ohaneze nakwa nke aruike.

Ngobese Zuma kwuputara na habu ndi obia sitere mba ozo nona mba South Africa ebi aka ojo na akuluba nakwa onatarachi mba ahu.

Omere ka amata na mba ndi ahu umu afo ha kachasi abanye na South Africa na uzo na ezighi ezi gunyere: mba Pakistan, Bangladesh, ala anyi bu Nigeria, mba Mexico nakwa otutu mba uwa ndi ozo.

Okpoziri oku ka agbara ndi a sitere ala anyi nakwa mba ndi ozo ugbonwamkpi na mba ahu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited