Ochichi Enugu State Akagbuola Nkpocha Na Nzacha Nke Onwa March Na State A.

Written by on March 27, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt Enugu State ekwuputala nkagbu mkpocha na nzacha kwa onwa akporo monthly environmental sanitation exercise nke onwa a bu March kara iwere onodu echi bu Saturday abali iri abuo na asato nke onwa a na mpaghara niile State a.

Nke a putara ihe unya bu Thursday na isi obodo Enugu site na ozi onye Managing Director ulo olu Enugu State Waste Management Authority ESWAMA bu Richard Onaga nyefere ndi nta akuko.

Onaga gwara ndi nta akuko na nkagbu mkpocha na nzacha a nke onwa a bu kwere maka ule nnwale akporo Mock Examination ulo olu Joint Admissions and Matriculation Board JAMB ga achikoba na mpaghara niile nke ala anyi a bu Nigeria yabu echi bu Saturday gaara ndi ga elele ule Unified Tertiary Matriculation Examination UTME nke afo a.

Yabu onye Managing Director ulo olu ESWAMA kwuputara na nkagbu mkpocha na nzacha a ga enyezi ohere ka ndi sitere State a sonyere nke oma na yabu ule nnwale JAMB Mock Examination.

Richard Onaga tara aka na eze gaara onodu di anaa nkagbu yabu mkpocha na nzacha nwere ike iwetara ndi bina State a dika oyoro ohaneze ka ha nogidesikwa ike idosa gburugburu ha ocha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited