Ejirila Ipia Utali Napu Otu Nwoke Ndu Ya Na Ike Dika Osiri Di Na Omenala Obodo Enwere Na Bayelsa State

Written by on March 27, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onodu amaghi kwuru adaputala na mpaghara Southern Ijaw LGA nke Bayelsa State dika otu nwoke gbara afo iri ano na asaa enyedebere aha ya dika Emi dara ma nwuo na ike oge ana enye ya ntarama ahuhu na usoro odinala ndi mpaghara ahu.

Nwoke a ka ozi mere ka amata na obu oge ana apia ya utali nwanne unya bu Wednesday dika osiri di na usoro omenala habu ndi Southern Ijaw LGA kwere maka ebubo na omara otu obere nwata nwaanyi di afo iri elu na ike ka odara ma kubie.

Ozi gakwara na iru kowa na obu onu ogugu utali iri na otu na otu ka onu ulo iri na abuo mejuputara mpaghara ahu ka omenala nyere ohere ipia onye kpara aru akwam iko na ike a ana ebo yabu nwoke ebubo nke mere na obu mgbakota onu ogugu utali di otu nari na iri abuo ka amalitere ipia yabu nwoke oge ahu odara ma kubie na ike.

Ndi huru ka ebubo ima elu na ike ahu eboro nwoke a siri mee gwara ndi nta akuko unya bu Thursday na obu oge obere nwata nwaanyi ahu so nne ya ukwu anata na ugbo ha gara ka nwoke a tochiri ya na ime ohia jiri akwam iko meto ya.

Ka osiladi, ozi a kowara na yabu Emi noziri oge apiagoro ya onu ogugu utali iri ano daa na ike, ebe emere ngwangwa buga ya ulo ogwu dina obodo ahu buzi ebe onoro kubie.

Onodu a buteziri amaghi kwuru dika ndi ntorobia iwe dina obi nuputara na igwe na ogbe di ichiche na yabu Southern Ijaw LGA, ebe ndi agha soldiers kwakojuru onwe ha na ngwa ogu sitere ogige Ogboinbiri military base wuchigoro na oge ndeko akuko a unya iweghachite ezi onodu kwere maka ujo ogbaghara ikawanye njo na mpaghara ahu.

Na okwu ogwara ndi nta akuko yabu unya bu Thursday ka ode akwukwo mgbasa ozi na okwa Chief Press Secretary nyere onye isi oche Southern Ijaw LGA bu mazi Ayeba Itari Easterday katoro ogbugbu ahu adi na igwe jiri utali gbuo nwoke a ana enyoenyo.

Mazi Easterday mere ka amata na govt agaghi anagide yabu akparama agwa ndi mpaghara ahu kpara.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited