Odachi Ihe Mberede Okporo Uzo Akpala Ike Ojo Na Enugu State

Written by on March 30, 2026

by Maduabuchi Onwe

Ihe ruru mmadu ato anwuola na ihe mberede okporo uzo mere na uzo awara awara ahu siri Enugu gawa Onitsha na ubochi Saturday abali iri abuo na asaato nke onwa March afo a bu 2026.

Yabu ihe mberede ka ozi mere ka amata na omere na etiti otutu ugboala nke otu na ime ha bu ugboala Toyota sienna buu ndi nta akuko aga oru na Igbo-etiti local government area nke state a.

Ozi gakwara na iru mee ka amata na ulo mgbasa habu ndi nta akuko ihe mberede metutere gunyere: Ulo mgbasa ozi nkiri onyonyo amara dika African independent television AIT, nakwa Nigerian television authority NTA.

Kosiladi, ufodu ndi nta akuko nwetere ihe mmeru aru gunyere: onye isi oche otu jikoro ndi nta akuko na NTA nke Enugu bu maazi Chimaroke Ugwu, nakwa onye oru eserese ya bu Gerald Ugwuanyi, ndi ozo gunyere, onye ode akwukwo alaka otu jikoro ndi nta nke Private Broadcast Chapel na Enugu bu maazi Kelechi Ekeledo nakwa onye oru eserese ya bu Ifeanyi Ogbodo tinyekwara otutu ndi ozo.

Ndi huru ka habu ihe siri mee oge ha na agwa ndi nta akuko okwu mekwara ka amata na aka achoputabeghi aha mmadu ato ahu tufuru ndu ha na yabu ihe mberede.

Na okwu ya ka onye isi oche otu jikotara ndi nta akuko amara dika Nigeria Union of Journalists NUJ ngalaba ya nke Enugu State bu Comrade Obinna Ogbuka katoro etu ihe mberede si wee na eme kwamgbe kwamgbe na yabu okporo uzo, tie aka na obi gara ndi ezinaulo ndi oru mgbasa ozi ahu yabu ihe mberede metutere.

Na ikpazu ka akuko mere ka amata na nnyocha gana aga na iru ichoputa ihe butere yabu ihe mberede okporo uzo na state a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited