Governor Otti Akpola Oku Ikwalite Ulo Akwukwo Mahadum Ebe Ana Agu Gbasara Iwu Dina Enugu State.
Written by admin on April 8, 2026
by Maduabuchi Onwe
Aka na achi Abia state bu governor Alex Otti ekwuputala njikere odi isonyere nke oma na ibugo mahadum ala anyi ebe ana agu gbasara iwu dina Enugu state na ogogo ka mma.
Ogakwara na iru kpokuo ndi governors nille enwere na mpaghara south-East ka ha jiko aka onu wee kwalite yabu ulo akwukwo mahadum, ma mee ya ka oburu okaibe na ala anyi bu Nigeria.
Nke a putara ihe site na ozi onye ode akwukwo mgbasa ozi nyere governor Otti bu Ukoha Njoku nyefere ndi nta akuko ngwangwa governor Otti yana ogbo ya ndi ozo na mpaghara south-East nwechara ogbako ka aga esi wulite ngalaba iwu na mpaghara south-East na obi government state ahu dina Umuahia bu isi obodo Abia state na ubochi Tuesday.
Iga echetazi na onye coordinator nakwa onye isi otu council na ahu maka agumakwukwo ihe gbasara iwu na yabu mahadum bu Emeka Ngige (SAN) noro na mbu wee kwuputa na yabu mahadum noo na ajo onodu nke enweghi akuru ngwa eji akuziri umuakwukwo ihe nakwa otutu ihe ndi ozo.
Na ikpazu ka okwuputaziri njikere ha di ibugo yabu mahadum na ogogo di elu, dika otoro ndi okaiwu ala anyi maka mbo ha na agba n’ idozi esemokwu na ala anyi a bu Nigeria.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.