Otu Nwoke Sitere Ebonyi State Efuola Na Ike Na Enugu State

Written by on April 21, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu nwoke gbara afo iri ato na ise enyere aha ya dika Ivi Joseph ma buru nwa afo Akaeze Ihenta nke Ivo LGA na Ebonyi State efuola na ike na Enugu State.

Nke a putara ihe site na ozi onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State a bu SP Daniel Ndukwe nyefere ngalaba akuko uwa anyi bukwanu ebe onoro kowa na obu nwanne nwoke onye a na efu efu bu Chisom Chukwu Eze wetara habu ndi uwe ojii mkpesa maka ofufu nakwa ochicho ana acho yabu nwoke.

SP Ndukwe kowara na Chisom Chukwu Eze gwara habu ndi uwe ojii na obu kemgbe abali isii nke onwa March gara aga afo a bu 2026 ka yabu Ivi Joseph rapuru ebe obibi ha dina Akwuke nke Garriki na isi obodo Enugu ma gawa ebe ana amaghi.

Okowara na emechara noro echi ya bu abali asaa nke yabu onwa gara aga huta nwoke a na efu efu nke ikpeazu ya na mpaghara Holy Ghost dikwu na yabu isi obodo Enugu.

Na oge ona akowa na mbo niile agbagoro ichota ebe ono kuchara afo na ala ka SP Ndukwe gwara ngalaba akuko uwa anyi na nwoke a ana acho acho didebere ogologo na otu ntu metre na uma asaa, ebe onwere akpukpo aru di oji, dika ona enweghi akara agburu na iru mana asusu Igbo na nke bekee na aga ya werewere na onu.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na State a mere ka amata na nwoke a na efu efu nwere nsogbu uburu, dika oyoziri ohaneze onye hutara ma obu nwe ozi ga enye aka ichoputa ebe nwoke a no ka onye di etu ahu kpoturu isi ulo olu ndi uwe ojii kachasi di ya nso.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited