Uzodimma Awuola Okorocha Na Ala Na Ntule Aka Ochichi Ime Ulo APC Maka Okwa Senate
Written by admin on May 19, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Aka na achi Imo State bu Gov Hope Uzodimma eturula ugo dika onye ga eji okoloto otu ndorondoro All Progressives Congress APC zoo okwa Senator maka ogbonta vote Imo West Senatorial District nke ulo nzuko ukwu Senate ala anyi na ntule aka ochichi izugbe afo 2027.
Gov Uzodimma nwetara mmeri a site na ntule aka ochichi ime ulo otu ndorondoro APC chikobara unya bu Monday maka ogogo Senate na ala anyi niile.
Na yabu ntule aka ochichi ime ulo APC Senatorial Primaries maka Imo West Senatorial District ka Uzodimma meriri onye kachasi maa ya aka na iru na izosa ya okwa a ma buru onye ahu jiburu okwa Governor State ahu bu Owelle Rochas Okorocha.
Gov Hope Uzodimma mere nke a site na akara vote di nari puku abuo, iri isii na ano, ebe Rochas Okorocha nwetara otu puku, iri iteolu na asato.
Na ogbonta vote Imo North Senatorial District ka Patrick Ndubueze nwetara nturu ugo dika onye ga eji okoloto APC zoo okwa Senator na afo 2027.
Na otu aka ahu ka Alex Mbata nwetara mmeri dika onye APC Senatorial candidate maka ogbonta vote Imo East Senatorial District na yabu ntule aka ochichi ime ulo.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.