Ndi Ntorobia Iwe Dina Obi Agbaala Oku Na Ogige Isi Ulo Olu Okpuru Ochichi Dina Kano State
Written by admin on May 18, 2026
by Chika Nwazu
Ihe oke ụjọ adaputala n’obodo Gwarzo bụ isi ọchịchị nke Gwarzo LGA dina Kano State ụnyaahụ bụ ụka kworo maka ngagharị iwe ndị ntorobịa n’obodo ahụ jiri ọgbaghara mee ma mecha munye ọkụ n’isi ụlọ olu gọọmenti nke okpuru ọchịchị ime obodo ahụ.
Ngagharị iwe ahụ nke ejiri ụzọ udo were malite mechara ghọọ ọgbaghara kworo maka nkusu ọzọ ndị otu Bandits bịara mee n’otu obodo ahụ nke ụmụ afọ ha kwuru na omela ka ha jiri ụjọ were biri.
Anya hụrụ ka ihe siri mee kwuru na ndị ntorobịa kariri otu narị nuputara n’igwe n’okporo ụzọ na-agụ egwu ma na-akpọkwa oku ka gọọmenti mara ihe ha mere na ọnọdụ ahụ ngwangwa.
Ha mechara mee ngagharị iwe ahụ gaa na yabu ogige local govt secretariat bụ ebe egwu nọrọ dagharia n’oge ụfọdụ ndị ntorobịa jiri ike banye n’ime ogige ahụ ma munye otu mpaghara ya ọkụ.
Emechara hụ ka ezipụrụ ndị ọrụ nchekwa n’akụkụ niile nke Gwarzo iji mee ka ọnọdụ dajụọ ma ghara imebi ihe ndị ọzọ, ebe ndị ọchịchị ka ozi kwuru na ha amalitela ilebara ọnọdụ a anya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.