Nwada Nigeria Eturula Ugo Dika Onye Ndu Otu Ndorondoro Na Ama Ochichi Mba Britain Aka Na Iru

Written by on May 28, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Otu nwada Nigeria bina mba Britain amakwuru dika mba United Kingdom bu Celia Hibbert Osakwe eturula ugo dika onye ndu otu ndorondoro na ama ochichi mba ahu aka na iru akporo opposition party na olu bekee bukwanu otu ndorondoro amara dika Reform UK na mpaghara Wolverhampton.

Celia Hibbert Osakwe bukwu onye omebe iwu na udi councillor noziri unya bu Wednesday kowa na oturu ugo a na okpuru ochichi Wolverhampton City Council.

Na okwu ogwara ndi nta akuko anyi ka nwada a bu nwa afo Igbo sitere Imo State kwuputara obi anuli ya nyere nturu ugo a.

Okowara afo ojuju ya nyere etu yabu otu ndorondoro Reform UK sigoro menyere ya na usoro nkwuba aka oto kwere maka mkpebi ya nyere odimma ohaneze.

Ogara na iru kowa na onwetaghi usoro oma imenyere Okeke ka esiri menyere Okafor ona enweta ka odi ugbu a oge osona otu ndorondoro Labour Party na yabu mba nwa onye ocha.

Celia Hibbert Osakwe kwere nkwa ezi mgbado anya, nkwuba aka oto nakwa itinye uchu gaara odimma umu afo yabu mba Britain ona aruru olu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited