Nyesom Wike Enyela Iwu Ohuru Ojiri Machie Ogbako Ufodu Alaka Otu Ndorondoro Ochichi Na Isi Obodo Nigeria

Written by on May 29, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Nwa amadi ahu jitopuru okwa Governor Rivers State bu Ezenwo Nyesom Wike enyela ntuzi aka gaara ndi nwe ogige ogbako nakwa ulo oriri na onunu na Abuja ka ha kwusi alaka otu ndorondoro ndi ahu ulo olu Independent National Electoral Commission INEC na anabataghi inwezi ogbako ozo na ogige ha dicha na yabu isi obodo Nigeria.

Nwa amadi a ji okwa Minister ala anyi na ahu maka isi obodo Nigeria bu Abuja na okwa FCT Minister yiri egwu inapu habu ndi nwe ogige ogbako nakwa ulo oriri na onunu ikikere ha ma ha nwa anwa ghara itinye ntuzi aka ohuru a na olu.

Ihe ndi a putara ihe taata bu Friday na Abuja site na ozi onyefere ndi nta akuko bu onye enyemaka puru iche ya na ihe metutara nzikorita ozi ohaneze nakwa owa ozi bu mazi Lere Olayinka.

Ntuzi aka a na abia dika ana ahuta nkawanye njo nke nkewa alaka na ufodu otu ndorondoro ochichi ama ama na ala anyi kwere maka ntule aka ochichi afo 2027.

Ufodu na ike habu otu ndorondoro nwegoro nkewa alaka abuo ma obu karie na ebughari onwe ha dika ndi iwu kwadoro na otu na otu gunyere: People’s Democratic Party PDP, African Democratic Congress ADC, Labour Party nakwa ufodu ndi ozo.

Ndi nta akuko wetaziri ozi na ntuzi aka ohuru a Nyesom Wike nyere taata enyego ndi nwere ogige mmeme ma obu ogbako nakwa ochichi FCT Administration ikikere idi na enwe mkpebi ogbako otu ndorondoro ochichi aga achikobanwu ma obukwanu nke na agaghi aganwu na yabu isi obodo Nigeria.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited