Ndị Isi Ekwe Onwu Akusuola Ulọrụ Nigerian Immigration Service Dina Ogbomoso Ma Napụ Otutu Ndị Orụ Immigration Egbe Ha

Written by on June 3, 2026

by Chika Nwazu

Ndị isi ekwe onwu akusuola ụlọrụ ndị Nigerian Immigration Services dina Ogbomoso nke Oyo State.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi na nkusu ahụ were ọnọdụ oge ọ kụrụ elekere iri nke ime abalị ụnyaahụ bụ Tuesday. Ebe ozi gara n’ihu kọwaa na ndị nọ ọrụ oge ahụ ka anapụchara egbe ha niile.

Otu nwa amadi sitere na Ogbomoso bụ onye na achọghị ka ndị nta akụkọ kpọọ aha ya bụ ya gwara ndị nta akụkọ maka ya bụ nkusu.

Ka osiladi, mbọ ndị nta akụkọ gbara inuta n’ọnụ onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Oyo Steeti bụkwa nke na amitaghi mkpụrụ ọbụla ruo taa bụ Wednesday.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited