Amala Mmadụ Anọ Ikpe Onwu Maka Ime Nkusu N’ụlọ Uka Dina Ondo State
Written by admin on June 3, 2026
by Chika Nwazu
Mmadụ anọ so n’otu isi ekwe ọnwụ akpọrọ terrorists abụrụla ndị amara ikpe ọnwụ iji ụdọ dogbue ha maka nkusu ha nọrọ n’abalị ise nke ọnwa June n’afọ 2022 mee n’ụlọ ụka Saint Francis Catholic Church dina Ọwọ́ Ondo State.
Ọ bụ ụlọ ikpe Federal High Court dina Abuja nke ọkaikpe justice Emeka Nwite nọ n’isi ya nọrọ taa bụ Wednesday kabie ikpe ya.
Ịga echeta na anọrọ n’oge ahụ gbuo ndị gara ife Chineke dị iri anọ na atọ n’ọnụ ọgụ.
Ndị ahụ ụlọikpe kwuru na ọ bụ ụdọ ka aga etinye ha n’olu ruo mgbe ha kubiri gunyere Idris Abdulmalik Omezia gbara afọ iri abụọ na ise, Al Qasim Idris gbara afọ iri abụọ, Jamiu Abdulmalik gbara afọ iri abụọ na isii yana Abdulhaleem Idris gbara afọ iri abụọ na ise.
Onye nke ise n’ime ha bụ Momoh Otuho Abubakar gbara afọ iri anọ na asaa ka asị ya laa n’aka ya dị ọcha.
Justice Nwite kwuru na ikpe mara mmadụ anọ n’eziokwu ma kwuo ka ahụ na ha kubiri ume tupu ewepu ha ụdọ n’olu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.