TCN Ekwuputala Ihe Mkpobi Ukwu Oku Electric Na Otutu Obodo Dina Delta State

Written by on June 6, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo olu mbunye ume oku ala anyi amara dika Transmission Company of Nigeria TCN emela ka amata na aga enwe ihe mkpobi ukwu megide nkesa oku electric na otutu obodo enwegasiri na Delta State.

Nke a ka TCN kowara na obu kwere maka olu ndozighari na ogige ume oku 132/33KV Transmission Sub-Station dina State ahu.

Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Friday site na owa ozi mmekorita ohaneze ka yabu ulo olu mbunye ume oku kwuputara na ihe mkpobi ukwu a malitere kemgbe unya bu abali ano, ebe oga akuru onu na abali iri na isii nke onwa a bu June.

TCN kwuputara na enweghi oku na habu obodo digasi na Delta State gana amalite na elekere iri nke ututu ruo elekere ise nke uhuruchi kwa ubochi iji nye ohere na olu ndozighari ahu.

Ulo olu a nyeziri nkowa sina ufodu mpaghara nkesa oku electric onodu a ga emetuta gunyere: Effurun, Warri, Osubi, PTI, PMSL, Refinery 1 and 2, Enerhen, Isoko/Kwale, Otovwode/Patani, Ughelli/Shell, Agbarho/Eku nakwa Aladja, Imoniyame gunyere mpaghara Beta Glass.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited