Ndi Enugu East Enyefela Gov Mbah Nari Nde Kwuru Nde Naira Ego Nkwado Maka Ntule Aka Ochichi Afo 2027
Written by admin on June 7, 2026
by Treasure Moses
Ndi onu na eru na okwu sitere ogbonta vote Enugu East Senatorial District nke Enugu State eweputala onyinye ego di nari nde Naira ato yabu; 3 Hundred Million Naira dika nkwado gaara nroputaghari aka na achi State a bu Gov Peter Ndubuisi Mbah na ochichi nke ugboro abuo ya na afo 2027.
Nke a putara ihe unya bu Saturday na ogige Michael Okpara Square dina isi obodo Enugu na nnukwute ogbako ndi sitere yabu ogbonta vote chikobara na isi obodo Enugu ma buru nke ha jiri kwuputa nkwado ha na ozuzu oke gaara President Bola Ahmed Tinubu nakwa Gov Mbah na ntule aka ochichi izugbe afo ozo.
Na okwu ya na ogbako a ka onye ahu jiburu okwa Senate President ala anyi bu Sen Ken Nnamani kowara aka na achi State a dika ezi onye ndu ochichi doro anya.
Na nke ya ka onye ahu jiburu okwa Governor Anambra State ochie bu Sen Jim Nwobodo kwuputara mkpa odi iroputaghari Gov Mbah na afo 2027 ka oga na iru na ezi ochichi ya.
Na aha ndi omebe iwu ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti sitere yabu ogbonta vote ka Hon Nnolim Nnaji kwuputara na nkwado ha bu kwere maka ochichi opuru iche aka na achi State a jigasi na aka.
Na nzaghachi ya ka Gov Peter Mbah kenere ndi Enugu East ma kwe nkwa iga na iru na ezi ochichi ka mma nyere ohaneze ndi State a.
Onye nta akuko anyi na obi govt Enugu bu Treasure Moses wetara ozi na anoziri na ogbako a huta ihe ikpa anuli di ichiche dika ngosi odinala, ebe onye kpolitere atumatu okwu nkwado ochichi nke ugboro abuo President Tinubu bu Senator na anochite yabu Enugu East na ulo nzuko ukwu Senate ala anyi bu Sen Kelvin Chukwu, dika Hon Nnolim Nnaji nke Nkanu East/Nkanu West Federal Constituency churu ya azu, Hon Iloabuchi Aniagu akpolitezie atumatu okwu nkwado nke Gov Peter Mbah, dika Hon Anthony Mbah gbara ya aja na ukwu.