INEC Agbala Akwukwo Ikpe Mkpeghari Megide Nkabi Ikpe Machiri Ya Inyedebe Otu Ndorondoro Di Ichiche Oge Maka Ntule Aka Ochichi Afo 2027
Written by admin on June 9, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC anorola taata bu Tuesday mee ka amata na nkabi ikpe ahu ulo ikpe kabiri banyere ndeputa oge ntule aka ochichi akporo election timetable nakwa ihe ndi ozo yiri ya aghola ihe iyi egwu megide ezi usoro ntule aka ochichi izugbe ga ewere onodu na afo 2027.
Iga echeta na ulo ikpe Federal High Court abuo noro na odi nso a kabie ikpe ma kachapu oge ulo olu INEC nyedebere otu ndorondoro di ichiche ka ha chikoba ntule aka ochichi ime ulo nakwa iweta igbe ndeko register ha, ebe habu ulo ikpe kowara na nke a megidere iwu ntule aka ochichi ala anyi amara dika Electoral Act, 2026.
Ka osiladi, na okwu ya taata bu Tuesday na ogbako quarterly consultative meeting ulo olu a were onodu na Abuja ka onye isi oche ulo olu INEC bu Prof Joash Amupitan mere ka amata na yabu ulo olu ntule aka ochichi ala anyi agbago akwukwo na ulo ikpe mkpeghari bu Court of Appeal megide habu nkabi ikpe.
Prof Amupitan kwuputara na igba akwukwo ikpe mkpeghari a bu dika ulo olu INEC lebachara anya nke oma na habu nkabi ikpe sitere ulo ikpe Federal High Court abuo.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na obu na abali iri nke onwa May gara aga ka INEC nyedebere otu ndorondoro di ichiche iweta igbe ndeko register ha, ebe ulo olu a nyedebere habu otu ndorondoro abali iri ato nke yabu onwa May gara aga ichikoba ntule aka ochichi ime ulo akporo Party Primaries, mana nkabi ikpe ahu sitere na ulo ikpe wetara onodu mkpobi ukwu megide habu nnyedebe oge.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.