CP Giwa Enyela Ntuzi Aka Ohuru Nchekwa Na Enugu State
Written by admin on June 12, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Commissioner ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State bu CP Mamman Bitrus Giwa enyela habu ndi uwe ojii na State a ntuzi aka ka ha kwalite olu nchekwa gaara mpaghara niile dina State a.
Ntuzi aka a putara ihe unya bu Thursday na ogbako strategic conference yabu Commissioner ndi uwe ojii chikobara nyere ndi welitere isi na olu uwe ojii na State.
Na ogbako a were onodu na ogige Senior Police Officers’ Mess dina Agbani Road nke isi obodo Enugu ka CP Giwa kowara na ntuzi aka a bu iji gbakwunyere udo na achi eze na State a.
Na ozi onyefere ndi nta akuko ka onye mmekorita ọhaneze nyere habu ndi uwe ojii bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na anoro na ogbako a nwe otu nkeji idere juu nyere onwu onye jitopuru okwa Commissioner ndi uwe ojii na State a ma buru onye Assistant Inspector General AIG na elekota Zone 9 dina Umuahia bu AIG Kanayo Uzuegbu bukwanu onye nwuru na odi nso a.
SP Ndukwe kowara na CP Giwa nyere ntuzi aka ka eziga ndi uwe ojii sitere ngalaba School Protection Squad SPS na ulo akwukwo niile enwere na State a maka ezi nchekwa umuakwukwo, ndi nkuzi nakwa ulo akwukwo ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.