Ndi Ntorobia Anaputala Ndi Atoro Na Ike Na Otu Obodo Dina Abia State

Written by on June 15, 2026

by Chika Nwazu

Otu nwoke na anya ogbatumtum ụkwụ atọ bụ kẹkẹ napep bu onye sitere n’obodo Umuawa Alaocha dị na mpaghara Ohuhu, n’ime Umuahia North Local Government Area nke Abia State, bụ Maazị Dennis Izuchukwu Okechi, akọwala etu ndị otu Bandits sịrị tọrọ ya na otu nwanyị aha ya bụ Odoziaku Onyinyechi Ekechukwu banye n’ime ohịa ma yie egwu na ha ga-egbu ya n’ihi na ọ na-asụ asụsụ Igbo mgbe ha nyere ya ekwe ntị ka ọ gwa ndị ezinụlọ ya okwu.

Dị ka akụkọ si kwuo, ha bụ ndị otu Bandits toro mmadụ abuo ahụ n’ike mgbe ha na-alọta n’ọrụ ugbo ha n’ehihie ụbọchị Wednwsday gara aga, wee dọba ha n’ime ọhịa. E kwuru na ndị ahụ merụrụ ha ahụ ma nye Okechi iwu ka ọ kpọọ ndị ezinụlọ ya ka ha kwụọ ụgwọ mgbapụta ruru nde naịra iri.

Akụkọ ahụ gosikwara na mgbe e nyere Okechi ekwentị ka ọ kpọọ ndị ezinụlọ ya ka o jiri asụsụ Igbo gwa ha ebe a kpọchiri ha n’ime ọhịa Udengwu. A sị na nke a nyere ndị obodo ya aka ịmata kpọmkwem ebe ndị ahụ nọ. Mana mgbe ndị ntọri ahụ chọpụtara na ha enweghị ike ịghọta ihe ọ na-ekwu, ha were iwe, napụ ya ekwentị ma yie egwu na ha ga-agbagbu ya ma ọ bụrụ na ọ naghị asụ asụsụ Bekee.

A kọwakwara na ndị ntorobịa na ndị ndu obodo Umuawa Alaocha haziri ọchụchọ n’ime ọhịa nke mere ka a napụta ndị ahụ n’abalị otu ụbọchị ahụ. E kwuru na mgbe ndị ntọri ahụ hụrụ na ọtụtụ ndị obodo na-abịaru nso ebe ha nọ, ha hapụrụ ndị ha jidere ma gbapụ ọsọ site n’ụzọ ọzọ.

Ka ọ dị ugbu a, onye nnọchi anya mpaghara Ikwuano/Umuahia Federal Constituency bụ Obi Aguocha akatọla mwakpo ahụ ma kpọkuo ndị bi n’Ohuhu na mpaghara ndị ọzọ dị n’Ala Igbo ka ha guzobe otu ọrụ nche na ịkpachara anya iji gbochie ụdị omume ọjọọ dị otu a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited