Tinubu Ebinyela Aka Na Iwu Ohuru Ulo Olu NIMC
Written by admin on June 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ebinyela aka na iwu ohuru na achikwa usoro ulo olu njirimara akporo National Identity Management Commission NIMC Act, 2026 ma buru nke kachapuru ma nochie iwu yabu ulo olu nke emeputara na afo 2007.
Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Friday, abali iri abuo na isii nke onwa a bu June, afo 2026 ka onye isi ngalaba nzikorita ozi yabu ulo olu NIMC bu Dr Kayode Adegoke mere ka amata na iwu ohuru a President Tinubu binyere aka dika ogafechara nkwado ulo nzuko omebe iwu ogogo etiti ala anyi bu iji nwogha usoro ndeko njirimara nwa afo Nigeria nakwa ihe niile banyere ala anyi a na ogogo opuru iche nke mba uwa ma elegara anya na usoro nka na uzu nakwa akuluba ogbaru ohuru.
Dr Adegoke kwuputara na iwu ohuru a nyere ulo olu NIMC ikikere nchikwa ihe niile banyere usoro Nigeria’s National Public Key Infrastructure PKI nakwa nke Digital Public Infrastructure DPI ma sizi etu ahu noro na isi ugbo usoro ogbaru ohuru nke njirimara, ikikere nakwa nkwado owa ozi gaara govt nakwa ndi nkiti.
Okwuputara na iwu a titeghariri akara National Identification Number NIN dika isi sekpu nti nke nkowa njirimara onye na ala anyi a.
Nwa amadi a mekwara ka amata na iwu ohuru a weputara atumatu ogbaru ohuru di ichiche nke nka na uzu nyere ezi onodu gburugburu njirimara na ala anyi a.
Na ozi a Dr Adegoke binyere aka ka onye Director General yabu ulo olu NIMC bu Dr Abisoye Coker-Odusote noro to President Tinubu maka ibinye aka na iwu ohuru a ma kowa ya dika mkpebi yabu onye isi ala nyere ezi nhazighari ogbaru ohuru.
