Ndi Uwe Ojii Anaputala Onye Danyere Na Onyia Ndi Oji Egbe Eri Na Imo State

Written by on June 29, 2026

by Maduabuchi Onwe

 

NIGERIA-POLICE-FORCE-

Ndi uwe ojii ala anyi na lmo state anaputala otu nwoke enyere aha ya dika Chinonaobi Uchegbulam sitere Ubaha Orodo nke lmo state ndi ntori mmadu toro na odi nso a.

Habu ndi uwe ojii gakwara na iru mee ka amata na ha naputara nwamadi ahu na aka habu ndi ntori mmadu kpom kwem na ohia didebere okere ala Nekede, Ihiagwa nakwa Agbala nke dicha na Owerri west local government area nke state ahu.

 

Nigeria police

Police

Nke a putara ihe site na ozi onye Commissioner ndi uwe ojii ala anyi na state ahu bu CP Audu Bosso sitere na onu onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na lmo state bu DSP Henry Okoye wee nyefe ndi nta akuko taata bu Monday.

Na ikpazu ka ha mere ka amata na yabu nwamadi ndi ntori mmadu toro nozi na ulo ogwu ebe ona anara ogwugwo kwere maka ihe habu ndi ntori kuru ya na state ahu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited