AGWO EKWEGHIZIKWA ANYI NUO MMIRI DOSA IKO NA OGIGE IDP CAMPS – OCHICHI BENUE STATE

Written by on September 11, 2024

Ochichi Benue State etiela mkpu n’ oke olu kowa sina agwo n’ awakpozi mana akpa ike ojo n’ ogige ebe onodu ndi ahu gbara oso ize ndu ha na State ahu akporo Internally Displaced Persons IDP Camps enwere na mpaghara di ichiche nke yabu Benue State.

Obu onye Executive Secretary ulo olu gbata gbata nke State ahu akporo Benue State Emergency Management Agency BESEMA bu mazi James Iorpuu tiri mkpu a taata bu Wednesday oge ogara ikesara ndi gbara oso ize ndu ha akuru ngwa enyemaka n’ ogige IDP Camps enwegasiri na State ahu.

Mazi James Iorpuu gwara ndi nta akuko n’ anoro n’ odi nso a gaa nye mmadu iri na ise agwo tara n’ ime ndi ahu gbara oso ize ndu ha ogwugwo.

Okowara n’ ogwugwo habu ndi agwo tara kapuru govt Benue State ego di nde kwuru nde Naira kwere maka n’ ihe eji agwota onye agwo tara abughi obere ego.

Yabu onye BESEMA Executive Secretary kwuputara n’ ulo olu ya agago gba ogwu n’ egbu umu ariri n’ ogige IDP Camps nile enwere na State ahu dika otu n’ ime mbo ona agba ibu agha megide ike ojo habu agwo n’ akpa.

Okpokuziri ndi enyemaka n’ ala anyi nakwa ndi nke sitere mba ofesi ka ha gaa n’ iru n’ akwado govt Benue State n’ agha ona ebu emegide ike ojo habu agwo.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies