Aka chiburu Rivers State n’oge gara aga bụ Rotimi Amaechi ekwuola na agaghị ewepụnwu aka na-achị state ejiri ntụliaka were họpụta site na naanị okwu ọnụ.

Written by on March 20, 2025

Aka chiburu Rivers State ma bụrụkwa onye ruburu ọrụ dịka minista hụrụ maka njem okporo ụzọ n’ala anyị akatola mwepụ onyeisi ala Nigeria bụ President Bola Ahmed Tinubu kwụsịrị Gov Siminalayi Fubara na-achị Rivers State nọkwa ọrụ ya dịka gọvanọ yana osote ya bụ Ngọzi Ọdụ tinyere ndị omebe iwu nke state ahụ.

Ya bụ amụma nke onyeisi ala abụrụla nke ọtụtụ ndị nwere agba n’ala anyị nọ kemgbe na akato dịka agwa jugburu udele ma sigbuo nkakwu n’isi.

N’okwu ya ka Rotimi Amaechi kọwara agwa nke onyeisi ala dịka nke na-adabaghi n’usoro iwu. O kwuru na President Tinubu akwụsịla ọchịchị egbe bere ka Ugo bere na Rivers State.

Amaechi gara n’ihu kwuo na onyeisi ala emetola iwu na-achị ala anyị nke afọ 1999 bụkwa nke President Tinubu ṅụrụ iyi na ya ga echekwaba.

Na iwu ahụ ka Chibuike Rotimi Amaechi ruturu aka na alaka Section 188 bụ ebe kọwara etu e nwere ike si wepụ aka na-achị state n’ụlọ ọrụ ya nke na agaghị abụ ọgụ na mgba ka aga asị na ọ bụ ọchịchị ndị agha.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited