Aka na achi Ebonyi State bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru enyela nchitugodu na okwa gaara ndi Commissioners mmadu ato nona ochichi ya.
Written by Onyinye on March 19, 2025
Aka na achi Ebonyi State bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru enyela nchitugodu na okwa na udi amara dika Suspension gaara ndi Commissioners mmadu ato nona ochichi ya kwere maka abiaghi ogbako otu Ebonyi State Executive Council were onodu na obi govt ohuru State ahu dina Ochudo Centenary City, Abakaliki.
Nke a putara ihe unya bu Tuesday na Abakaliki site na ozi Commissioner na ahu maka mgbasa ozi nakwa mmugha agwa bu Hon Jude Chikadibia Okpor nyefere ndi nta akuko.
Na ozi a ka Hon Okpor noro kowa na habu Commissioners ato achitugoduru na okwa gunyere: Commissioner na ahu maka gburugburu bu Hon Victor Chukwu, nke na ahu maka ego enyemaka bu Hon Solomon Azi nakwa Commissioner na ahu maka mmepe imime obodo bu Hon Ikeuwa Omebe.
Na ozi a ka Gov Francis Nwifuru noro nye ntuzi aka si ka habu Commissioners ato puo na okwa olu ha otu onwa, ebe okowara na ihe niile kwesiri ha dika ndi Commissioners agaghi erute ha aka na ime yabu otu onwa.
Aka na achi Ebonyi State kowara na ogaghizikwa eleghara ha anya ozo bu enweghi ezi akparama agwa nakwa ejighi olu kporo mkpa bu ndi ochichi ohaneze na State ahu.
Na ozi a sitere na aka Hon Jude Chikadibia Okpor ka aka na achi State ahu noro doo aka na nti gaara ndi olu ngo ji olu okporo uzo nakwa olu ndi ozo nke govt Ebonyi State ka ha gbapu ha oso na habu olu ngo ma gbasoro usoro niile dina nkwekorita hana govt State ahu nwere ma obukwanu chee aka ghoro usoro iwu aga eji manye ha na ike ime ihe dina nkwekorita ha.
Yabu Commissioner mgbasa ozi sitere na ozi a kowa na govt State ahu nyere nkwado iruputa ogige obibi staff quarters, nke female hostel nakwa nke aruike health clinic na ogige NYSC Permanent Orientation Camp nke State ahu dina Old Macgregor College na Afikpo LGA maka odimma ndi ahu ji otu afo agara ala anyi ozi ezigara State ahu nakwa ndi olu ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.