EFCC adola aka na nti megide ibutere ha mkpobi ukwu na olu ndi ahu iwu ala anyi hanyere ha na aka.
Written by Onyinye on May 7, 2025
Ulo olu ala anyi ahu na ebu agha emegide ima ego nakwa akuluba ohaneze mmiri ojo akporo Economic and Financial Crimes Commission EFCC ayiola umu afo Nigeria ka ha rapu yabu ulo olu ka oruo olu iwu ala anyi hanyere ya na aka na enweghi ihe mkpobi ukwu.
EFCC mere ka nke a puta ihe unya bu Tuesday na okwu ya megide nnukwute gani gani otutu umu afo ala anyi na akpo megide mnwuchiko nakwa nnyocha ana eme nwa amadi ama ama na owa ozi bu mazi Martins Vincent Otse amakariri dika VeryDarkMan.
Ulo olu a kowara na mkpebi ya inwuchiko VeryDarkMan abughi maka nkato ya megide EFCC kama na obu kwere maka ederede edetagasiri megide ebubo agwa ekperima ego na nke akuluba ana ebo yabu nwa amadi.
EFCC sitere na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze unya kowa na anarago nwa amadi a na akaebe na udi Administrative Bail site na aka ulo olu ahu kama na aga atoghapuzi ya ma omezucha ihe ndi enyere ya na iwu na yabu akaebe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.