Gọọmenti Enugu state na njikọ aka ọnụ hana ụlọrụ White Rabbit Afro limited enwela nkwekọrịta Ị guzobe obosara ala ruru ntụ hectare iri abụọ ebe a gana akọputa nri cocoa nke ga enyeaka wulite akụnụba nke state a.

Written by on February 20, 2025

Gọọmenti Enugu state yana ụlọrụ nọrọ onwe ya akpọrọ White Rabbit Afro limited agbapela obosara ala ruru ntụ hectare iri abụọ ebe a gana akọputa nri cocoa bụ nke a na-atụ anya na ọ ga-eji ọkpụrụkpụ ego ruru ijeri dollar iri atọ $30 billion were wulite akụnụba nke state a.

Onye ji ọkwa Commissioner for agriculture and agro industrialisation na Enugu state bụ Mr Patrick Ubru kwuru nkea mgbe ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu ụbọchị Monday na Enugu.

O kwuru na ebe amụma ahụ ga e were ọnọdụ bụ na council ime obodo Nkanu East na Enugu state.

Onye Commissioner ahụ kwuru na ụlọrụ ha na ha na e jikọrọ aka ọnụ na ya bụ ọrụ emechala ihe niile iji malite nke gụnyere ị nweta mkpụrụ cocoa nke bụ opuru iche site n’ụlọ akwụkwọ cocoa Research institute of Nigeria dina Ìbàdàn Oyo State.

O gara n’ihu mee ka amata na mkpụrụ cocoa ahụ nke akụgoro ajụ epuola n’obodo Amechi Idodo nke dina council ime obodo Nkanu East bụ ebe aga anọrọ mee ya ka ọ mubanye.

Ebe o mere ka ọhaneze chọrọ iketa oke na ya kpọturu ụlọrụ ministry ya.

Onye Commissioner ahụ gbakwunyere na ọrụ n’aga n’ihu nọdụ ụgbọelu Akanu Ibiam International Airport dina Enugu ngalaba ana adọwa ibu bụ ebe aga emecha na esi ebuga mkpụrụ osisi ahụ na mba ụwa dịgasị iche iche.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies