GOV MBAH BU DIKE NKE NGALABA MMUTA NA ALA ANYI KA ONYE ISI UBEC NA NIGERIA NA EKWU
Written by admin on December 11, 2024
Etola aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah na ebe odi ukwuu maka mbo ona agba nyere ngalaba mmuta State a okachasi dika osiri metuta olu ngo ulo akwukwo Smart Green Schools omalitere na onumara Wards di nari abuo na iri isii na State a.
Otito a putara ihe unya bu Tuesday site na onu onye Executive Secretary ulo olu Universal Basic Education Commission UBEC bu Dr Hamid Bobboyi oge omegara aka na achi State a njem mkpoturu na ogige Lion’s Building nke obi govt Enugu.
Dr Bobboyi kowara ezi usoro mmuta dika mgborogwu nke onodu ka mma na odi na iru.
Yabu onye Executive Secretary ulo olu UBEC na ala anyi kwuputara nchekwube ya sina ezi olu Gov Peter Mbah nyere ngalaba mmuta ga ebugo Enugu State na ala oma nke ezi onodu mmepe toro ato.
Na nzaghachi ya ka yabu aka na achi Enugu State kowara na ihe kpalitere mmuo ya nyere nkwalite ngalaba mmuta State a na uzo puru iche bu iji zeere odachi na esitekari na enweghi ezi mmuta na odi na iru.
Gov Peter Ndubuisi Mbah kowara na emeghi nke oma nyere ngalaba mmuta amalitego igosi ajo mgbaama nke enweghi olu nakwa ubiam onu ntu na obodo a bu Nigeria.
Okowaziri na obu nke a kpatara ojiri etinye otu na ime okara ato nke kariri per cent iri ato na ato na ego nzube olu State a maka yabu ngalaba mmuta.
Aka na achi Enugu State gara na iru kwuputa na ochichi ya ji atumatu na aka iruputa ulo akwukwo ohuru nke Smart Senior Secondary Schools di iri na asaa na ime okpuru ochichi iri na asaa enwere na State a.
Gov Mbah kwuputakwara olu nruputa nke ulo akwukwo Science, Technical and Vocational Schools asato na ogbonta vote nke ogogo etiti asato enwere na State a.
Onye nta akuko anyi na obi govt Enugu bu Esther Iwuchukwu wetara ozi na obu ndi ahu welitere isi na ulo olu UBEC sonyere Dr Hamid Bobboyi na njem mkpoturu a, ebe ndi nke welitere isi na ochichi State a sonyere Gov Peter Mbah nabata ha.