Otu ahu jikoro ndi nwere nkwaru na ala anyi akporo Joint National Association of Persons With Disabilities JONAPWD ngalaba ya nke Enugu State ariola aka na achi state a ka ogbape ulo olu Enugu State Disability Commission maka odimma ha.
Written by Onyinye on April 14, 2025
Otu ahu jikoro ndi nwere nkwaru na ala anyi akporo Joint National Association of Persons With Disabilities JONAPWD ngalaba ya nke Enugu State akpokuola aka na achi State a bu Gov Peter Ndubuisi Mbah ka ogbape ulo olu Enugu State Disability Commission maka odimma habu ndi nwere nkwaru.
Otu JONAPWD yoro Gov Peter Mbah ka ome nke a dika imejuputa nkwa onoro na mbu kwee sina oga agbape yabu ulo olu na ime agba nke mbu na afo a bu 2025.
Otu a kowara na ime nke a ga eme ka ndi nwere nkwaru sonyere na ezi elele ochichi na State a.
Na okwu ya na nzuko otu a were onodu nwanne unya bu Saturday na isi obodo Enugu ka onye isi oche otu JONAPWD na State a bu Comrade Onyebuchi Mbah chetara Gov Peter Mbah etu osiri noro na onwa December afo 2024 gara aga kwe ha nkwa igbape yabu ulo olu Enugu State Disability Commission na ime agba nke mbu akporo First Quarter afo a bu 2025.
Na oge ona ayo aka na achi State a ka omejuputa nkwa ahu okwere ka Comrade Mbah gara na iru yoo ya ka ogbata oso enyemaka site na ititeghari ogige mmuta Braille Resource Centre maka ndi na anaghi afu uzo na State a site na usoro Green Smart School Project ochichi ya ji na aka.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.