Otu ndị agha ọ lụọ ọ laa akpọrọ M23 Rebels group nke ji mba Democratic Republic of Congo mere isi ọnọdụ e wegharala obodo Bukavu nke dị na ọwụwa anyanwụ mba ahụ.
Written by admin on February 17, 2025
Ahụtala otu ndị agha M23 Rebels group na ama gọọmenti aka n’ihu na mba D R Congo ka ha yicha efe ndị agha were na agwa igwe mmadụ gbakọrọ n’obodo Katana okwu bụ obodo didobere ọdụ ụgbọelu Kavumu Airport nke mba DR Congo.
Nkea na-abịa dịka otu M23 Rebels bụ ndị e kwuru na ọ bụ mba Rwanda na akwado ha wegharachara ọnọdụ n’obodo ahụ.
Ọbụ ụnyaahụ bụ ụka ka otu M23 Rebels nọrọ jiri nwayọọ n’enweghị ihe mgbochi ọbụla wee jiri ngwa ọgụ ha wubata n’obodo Bukavu n’agbanyeghị oku mba DR Congo na-akpọ kemgbe ka hana mba Rwanda kpaa udo ma tinye mma ha n’ọbọ.
Ha bụ ndị otu isi ekwe ọnwụ anọrọla kemgbe na-akpụ gani gani etu ha ga-esi zọọ ụkwụ n’obodo ahụ eji azụmahịa were mara kemgbe ha wegharachara ọnọdụ ha n’obodo Goma na ngwụcha ọnwa January gara aga.
Ka ọ dị ugbu a, ọchịchị mba Congo ekwuola ya hoo haa n’obodo Bukavu nọzikwa n’aka otu M23 Rebels group ebe ha bokwara ebubo na ndị agha mba Rwanda so ha bata n’obodo ahụ.