Ụlọ Nzukọ nsọ Catholic amalite ime ntụli aka ihoputa onye ụkọ Chukwu ọhụrụ ga anochi anya Pope Francis lagoro mmụọ.
Written by Onyinye on May 8, 2025
Ndị ụkọ Chukwu nke nzukọ nsọ Catholic ọkwa ha gbagotere nọkwa nke cardinals adịla njikere ọzọ taa bụ Thursday ị lọghachi azụ n’ogige Sistine chapel bụ ebe ha ga anọrọ mee ntụli aka onye ha ga-eji dochie anya pope Francis nwụrụ na ọ dị nso a.
Ozi mere ka amata na ọ bụ ụnyaahụ bụ Wednesday ka ha nọrọ malite ntụli aka ahụ mana e mechara bugookwa ya taa bụ Thursday.
Na Uhuruchi ụnyaahụ ka anọrọ hụ ka anwụrụ ọkụ ojii si n’elu ụlọ ahụ n’aga n’igwe nke gosiri na ntụli aka ahụ ezubeghi ma ọ bụ bịa n’isi njedebe.
N’ozi sitere n’obodo Vatican na ekwu na aga anọrọ n’isi ụtụtụ taa malite ya bụ ntụli aka ọzọ.
Na mgbe ntụli aka ahụ kụrụ ọnụ ka ana atụ anya na aga ahụ anwụrụ ọkụ ọcha ka o sikwa n’elu ụlọ ahụ n’aga n’igwe nke gosiri na ihe niile abiala n’isi njedebe ebe nnukwute onye ụkọ Chukwu ọhụrụ aputala ihe.
Emere ka amata na onwebeghi onye ụkọ Chukwu ahụ nọkwa nke pope a họpụtara otu mgbe nke pụtara na anwụrụ ọkụ ojii ahụ bụ nke atụrụ anya ya. Mana ya bụ ntụli aka ga achịkoriri ọnụ n’abalị nke abụọ bụ taa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.