Otu ndọrọndọrọ ọchịchị People’s Democratic Party PDP ngalaba ya nke Abịa state achụola Sen Adolphus Wabara ọsọ ụkwụ eru ala.

Written by on March 6, 2025

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị People’s Democratic Party PDP ngalaba ya nke Abịa state achụola nwa amadi ahụ ji ọkwa board of trustees nyere otu party ahụ bụ Sen Adolphus Wabara ọsọ ụkwụ eru ala.

Nkea sitere n’ọnụ otu state working committee nke PDP na mkpebi ha nwere ụnyaahụ bụ Tuesday n’oge ọgbakọ ntumadi ha nwere kworo maka mkpesa sitere n’aka otu Disciplinary committee ha guzobere banyere nwoke ahụ jibu ọkwa nke Senate president n’ala anyị.

Ya bụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị gbadoro ụkwụ na ụfọdụ alaka iwu ha kwuru na onye ọ bụla a chụrụ achụ agaghị erite elele ọbụla ọzọ dịka ogbo ya ndị kwesịrị ntụkwasị obi nyere ya bụ otu PDP.

Ha bụ otu PDP na Abịa State sitere n’akwụkwọ ozi were gwa otu party ahụ n’ala anyị ka ha kpọlite onye ga ejirigodi ọkwa nke board of trustees ahụ iji mee ka otu PDP ghara ịkpụ afọ n’ala ma nyuo ka ọkụ n’ala anyị.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited