Ụfọdụ ụmụ nwanyị emela ngaghari iwe na Port Harcourt, Rivers State.
Written by Onyinye on April 15, 2025
Ụfọdụ ụmụ nwanyị sitere Port Harcourt, Rivers State anọrọla taata bu Monday mee ngaghari iwe bu nke ha mere n’ụzọ udo iji kwado ọnọdụ gbatagbata emere na State ahụ.
Ụmụ nwanyị ahụ bu ndi gbakọtara ọnụ na Garrison Bus Stop dị n’isi obodo State ahụ na elekere asatọ na ụtụtụ iji malite njem ha.
Ahutara ha ebe ha na ekwe ukwe nkwado gara nwa amadi ahụ ahọpụtara ka ọ na elekọta ọchịchị State ahụ bu Retired Vice Admiral Ibok-Ete Ibas n’okporo uzọ Aba road dika ha na aga na obi government state ahụ.
N’izu ụka gara aga ka puku kwuru puku ụmụ nwanyị n’okpuru Rivers Women for Sim, mere ngaghari iwe megide ọnọdụ gbatagbata emere na State ahụ nakwa nkwusi ọrụ akwụsịri Governor Siminalayi Fubara.
Ịga echeta na onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu nọrọ na abalị iri na asatọ n’ọnwa March afọ a bu 2025, mee ọnọdụ gbatagbata na Rivers State kwere maka nsogbu okwe ndọrọndọrọ ana ahụta na State ahụ.
Ewezuga yabu ọnọdụ gbatagbata, President Tinubu kwụsịrị Governor Fubara, osete ya bu Ngọzi Odu nakwa ndị otu omebe iwu Rivers State House of Assembly nile ọrụ ọnwa ịsịị, ma kpọlite Ibas dika onye ga na elekọta State ahụ n’oge ọnọdụ gbatagbata ọ nọ n’ime ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.