President Donald Trump emerubela mmeme ncheta otu nari afo onogoro n’ okwa ochichi ya.
Written by Onyinye on April 30, 2025
Aka n’ achi mba America bu President Donald Trump emerubela mmeme ncheta afo otu nari onogoro n’ okwa ochichi ya nke ugboro abuo, ma nyekwa nkwuwa okwu banyere otutu ihe ndi omeputagoro tinyekwara ihe ima aka n’ iru ndi ona afu.
N’ ogbako ochikoara na Michigan bu nke dotara otutu ndi nkwado ya, ka trump noro kowa usoro ochichi dika nke n’ eweta ezi mgbanwe n’ uwa nile.
Ndi otu ndorondoro Republican noro n’ oge ahu katoo otu ndorondoro Democrat nke onye jiburu okwa president mba ahu bu formal President Joe Biden,ma katokwa usoro ochichi nke onye isi oche US federal reserve.
Donald Trump kwuputakwara ochuchu ohuru ndi ahu si uzo nkpuke banye mba US, tinyekwara ngbochi ogbochiri ogbaghara nke usoro azum ahia.
President Donald Trump nokwara n’ oge ahu kwuputa atumatu iji n’ aka maka ikwalite onodu akuluba tinyekwara utu isi gara ibubata akurungwa ugbo ala na mba ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.