Mba Israel agala n’ iru na agha mwakpo ha n’ emegara mpaghara Gaza’s strip nke mba Palestine.

Written by on April 30, 2025

Mba Israel amalitela agha ahu ha n’ ebuso mpaghara Gaza’s strip dika ha gbuchara opekata mpe ya buru mmadu iri ato na asato na mpaghara ahu unya bu Tuesday.

Otu united nations akpola oku ka eweputa usoro aga eji kwusa oke ogbugbu a ana egbu ndi mmadu na Gaza dika agha mba Israel n’ ebuso ha banyegoro na mkpuru ubochi iri isii k’ odi ugbua.

Ndi agha mba united kingdom emela ka amata na ndi agha mba Britain sonyere ndi nke mba US n’ ibuso ndi agha nti ikpo akporo houthis rebel agha na mpaghara Yemen.

K’ osiladi,mba Israel na aka nke ha,atohapula mmadu iri bu umu afo mba Palestine ha jichiri ejichi site na Gaza,

Ulo olu aru Ike mba Palestine emela ka amata na opekata mpe ya buru mmadu di puku iri ise na abuo,nari ato na iri isii na ise bu umu afo mba Palestine nwugoro anwu site n’ ogbaghara a,ebe ndi ruru otu nari puku na iri na asaa, nari itolu na ise nwetara ihe mmeru aru tinyekwara otutu ndi nke ka n’ efu efu bu ndi nke ana atu anya na ha nwere Ike inwugo k’ odi ugbua.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited