Onye bụbu onyeisi ala mba Gabon achịturu nọkwa ya site n’aka ndị agha n’afọ 2023 enwerela onwe ya.
Written by Onyinye on May 17, 2025
Onye bụbu onyeisi ala mba Gabon achịturu nọkwa ya site n’aka ndị agha n’afọ 2023 bụ Alị Bongo enwerela onwe ya ma hapụ obodo ahụ ngwa ngwa ma wuchaa na mba Angola.
Nkea pụtara ihe site n’ozi onyeisi ala mba Angola zipụrụ na ọwa ozi bụ ebe ọ nọrọ kwuo na Ali Bongo yana ezinụlọ ya n’ozi n’obodo Lunda na ekuru ume ndụ.
Ali Bongo bụ onye nna ya bụ Omar Bongo chịrị mba Gabon ọtụtụ afọ ndị gara aga achila mba ahụ afọ iri na anọ ruo n’ụbọchị ahụ ejiri aka napụ ya ọkwa ọchịchị n’afọ 2023 site n’aka ndị agha mba ahụ nke General Brice Oligui Nguema nọ n’isi ya.
Ejichiri ya n’ụlọ ya nụdi ahụ nwa bekee kpọrọ house arrest mana ugbua, a tọhapụla yana ndibe ya ka ha nwere onwe ha ma chụọ ha ọsọ ụkwụ eru ala na mba ahụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.