Ajo onodo abawanyela njo na mpaghara Gaza’s strip kwere maka mmachi mba Israel machiri ibubata nri na mpaghara ahu.
Written by Onyinye on May 21, 2025
Otu United Nations UN emela ka amata na ndi otu ha no na mpaghara Gaza’s strip nke mba Palestine enwetabeghi ohere ikesa akurungwa enye m aka ha bu n’ agbanyeghi otutu ugboala truck bu akurungwa ndi a abanye na mpaghara ahu kemgbe abali abuo k’ odi ugbua.
Ndi olu agha mba Israel mere ka amata na ugboala truck di iri itolu na ato bu otutu akuru ngwa enye m aka ndi gunyere,ntu flour,nri umuaka, akurungwa eji erekota aru Ike, tinyekwara otutu ogwu digasi iche iche batara na Gaza unya bu Tuesday.
Kama ana otu UN kana ekwu si, n’ agbanyeghi na ugboala truck ndi a abarutego na mpaghara kerem shalom nke mba Palestine, na ha enwetabeghi ohere ikesa akurungwa enye m aka obula.
Ndi nta akuko nwetara ozi na mba Israel noro n’ ubochi uka gara aga nkwekorita ka ebubata ufodu nri na Gaza kama na ojo onodu ogbaghara na akawanye njo ekweghi ka ekesa ha bu nri.
K’ osiladi, mba UK akwusila mkparita ububo azum ahia ha nwere nyere mba Israel kwere maka ihe ha kowara dika ajo akpara m agwa ha gara mpaghara Gaza’s strip.
Na nzaghachi ya,ka onye okwuputa okwu nyere mba Israel n’ ihe n’ eme na mba ndi ozo mere ka amata,na enweghi udiri iyi egwu obula ga eme ka mba Israel gbanwe obi ha na agha ahu ha n’ ebu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.