Ndi ochichi mba Pakistan akatola mwakpo awakpolo ugboala bu umu akwukwo ma gbuo opekata mpe ise n’ ime ha.
Written by Onyinye on May 21, 2025
Nwa amadi ahu ji okwa interior minister mba Pakistan bu Mohsin Naqvi akatola adachi ahu ejiri wakpo ugboala bu umu akwukwo ma gbuo otutu n’ ime ha dika okowara ya dika ndi Ajo obu bu ndi nke anya ha di n’ igbu umuaka n’ udi ikwatu Obodo ahu.
Ndi agha mba ahu n’ ebo mba India ndi gbara ha agbatobi ebubo banyere utu ihe mgbanwa ahu kama na ha enwetabeghi ihe aka ebe obula banyere nkea.
Iga echeta na mba Pakistan nakwa India kana aputa n’ Ajo ogbaghara were izu uka abuo bu nke ndi otu isi ekwe onwu banyere na mba India butere.
Mba Pakistan goro si n’ aka ha adighikwa na mwakpo ahu kama na mba India gara n’ iru n’ ebuso ha agha ma n’ atukwa ogbu n’ igwe n’ ulo olu digasi na mba Pakistan.
Na mbido onwa March afo o ka ha noro gbuo ndi nkiti di iri abuo na otu tinyekwara ndi agha ano n’ oge ana enye ha ozuzu na mpaghara Balochistan.
Ozi kowara na mwakpo ahu sitere n’ aka otu Balochistan liberation Army BLA bu otu ahu anoro n’ otutu afo gara aga gbochie inwere onwe ha.
K’ osiladi, ndi ochichi mba Pakistan,UK na US ekwuputago otu BLA dika otu isi ekwe onwu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.