Ọgbaghara n’ada n’etiti otu ndọrọndọrọ PDP na South-East ewegharala ụzọ ọzọ ụnya bu Wednesday.
Written by Onyinye on May 23, 2025
Ọgbaghara nke zonal n’ada n’etiti otu ndọrọndọrọ Peoples Democratic Party PDP na South-East weghara ụzọ ọzọ ụnya dịka Chief Chidiebere Egwu kwuru na ọ bu ya bu ezigbo osote onye isi oche nke otu ndọrọndọrọ PDP na South-East na ọbughi Chief Ali Odefa, dika ọ kwụsịrị ike na achụpụrụ Odefa site n’otu ndọrọndọrọ ahụ.
Ozi putara ihe na Abakaliki bu isi obodo State ahụ, mere ka amata na Chief Egwu kọwara ọgbakọ ụfọdụ ndị stakeholders nke otu ndọrọndọrọ ahụ mere na ọdịnso a bu nke were ọnọdụ na Government House Enugu, bukwanụ nke Chief Odefa bu onye jibu ọkwa National Vice Chairman achụpụrụ achụpụ nọ n’isi dika nke iwu na akwadoghi.
Chief Egwu gara n’iru mee ka amata na ọgbakọ emere na ọdịnso a na Abuja, na ndi zonal stakeholders kwughachiri nkwado ha gara Samuel Anyanwu dika onye National Secretary, n’okwu ya, ọ kọwara na ndi stakeholders bịara yabu ọgbakọ bu ndị Party leaders ndị gụnyere, nwa amadi ahụ jibu ọkwa Governor na Abia State bu Dr. Okezie Ikpeazu, Samuel Anyanwu, Michael Amah Nnachi, Paulinus Igwe Nwagu, Jones Onyeriri, Zonal Legal Adviser, Ukpai Ukairo, Zonal Organising Secretary, Mike Ahumibe, PDP Chairmen of Imo and Abia States tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ.
O mekwara ka amata na nkwurịta okwu ha na ngwucha n’ọgbakọ ahụ kpalitere mmụọ ha n’ikpọkụ National Working Committee NWC nke otu ndọrọndọrọ ahụ ka ha rube isi n’iwu ụlọ ikpe okpecha ọgwụ kpebiri bu nke kwuputara n’ụzọ doro anya na ọ bụ Anyanwu bu odeakwụkwọ otu ndọrọndọrọ ahụ, dika ọ gara n’iru kpọkuo NWC nakwa ohaneze ka ha leghara anya nzukọ ahụ e mere n’iwu nke Chief Odefa.
Kosila di, ndị South-East Zonal Executive Committee nke PDP ewepụtala nhọpụta nke Sunday Udeh-Okoye n’aka Acting National Working Committee nke otu ndọrọndọrọ ahu dịka National Secretary.
Ịga eheta na ndị isi otu PDP na South-East nọrọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa May anyị nọọ n’ime ya, họpụtagharia Udeh-Okoye ka ọ bụrụ National secretary nke otu ndọrọndọrọ ahu, ndị isi otu ndọrọndọrọ na mpaghara South-East kwuputara mkpebi a n’akwụkwọ ozi ha wepụtara na ngwụcha ọgbakọ ha mere na Enugu n’abalị iri na anọ nke ọnwa May anyị nọ n’ime ya, dika ha gara n’iru kpebie isi na otu ndọrọndọrọ PDP pụọ ma ọ bụrụ na ndị National Leadership anabataghị nhọpụta ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.